2 Ndị Eze 23:16
2 Kings 23:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Josaya legharịkwara anya gburugburu hụ ọtụtụ ili dị nʼelu ugwu. O ziri ndị ohu ya ka ha gaa chịpụtasịa ọkpụkpụ dị nʼili ahụ niile, kpọọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja imerụ ya, dịka okwu Onyenwe anyị si dị, nke onye nke Chineke kwupụtara mgbe o buru amụma banyere ihe ndị a.
2 Kings 23:16 in English
2 Kings 23:16 · Berean Standard Bible
And as Josiah turned, he saw the tombs there on the hillside, and he sent someone to take the bones out of the tombs, and he burned them on the altar to defile it, according to the word of the LORD proclaimed by the man of God who had foretold these things.*
Context
14Josaya kwadakwara ogidi nkume niile, gbutuo ihe arụsị Ashera niile, werekwa ọkpụkpụ ndị mmadụ wụsa nʼelu ala ahụ niile. 15Josaya kwadakwara ogidi niile dị na Betel, nke Jeroboam nwa Nebat wuru mgbe o dubara ndị Izrel na mmehie. Ọ kwadara ebe ịchụ aja dị nʼebe ahụ, kụjisie nkume e doro nʼebe ahụ, gwerie ha dịka ntụ. Ọ kpọkwara arụsị Ashera ọkụ. 16Josaya legharịkwara anya gburugburu hụ ọtụtụ ili dị nʼelu ugwu. O ziri ndị ohu ya ka ha gaa chịpụtasịa ọkpụkpụ dị nʼili ahụ niile, kpọọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja imerụ ya, dịka okwu Onyenwe anyị si dị, nke onye nke Chineke kwupụtara mgbe o buru amụma banyere ihe ndị a. 17Josaya jụrụ ndị guzo nʼebe ahụ ajụjụ sị, “Ọ bụ ili onye bụ nke a?”
Ndị ikom obodo ahụ zara sị, “Ọ bụ ili onye nke Chineke ahụ si Juda bịa buo amụma megide ebe ịchụ aja Betel. O buru amụma na ihe ndị a ị na-eme ebe ịchụ aja a ga-emezu.” 18Mgbe ahụ, Josaya zara sị ha, “Hapụnụ ya ka o guzoro onwe ya. Ka nwoke ọbụla gharakwa ịchịpụta ọkpụkpụ ya.” Ha hapụrụ ọkpụkpụ ya, hapụkwa ọkpụkpụ onye amụma ahụ si Sameria bịa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.