Native Bible

2 Kings 22:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Gwa ha ka ha nyefee ya nʼaka ndị ikom ahọpụtara maka ilekọta ọrụ nʼụlọnsọ ahụ. Ka ndị ikom a kwụọ ndị ọrụ na-arụzi ụlọnsọ Onyenwe anyị ụgwọ ọrụ,

2 Kings 22:5 in English

2 Kings 22:5 · Berean Standard Bible

And let them deliver it into the hands of the supervisors of those doing the work on the house of the LORD, who in turn are to give it to the workmen repairing the damages to the house of the LORD—

Context

3Nʼafọ nke iri na asatọ nke ọchịchị ya, eze Josaya, zigara ode akwụkwọ bụ Shefan nwa Azalaya, onye bụkwa nwa nwa Meshulam, ka ọ gaa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. Ọ sịrị ya, 4“Gakwuru Hilkaya onyeisi nchụaja, sị ya, gụkọta ego nke e webatara nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, bụ nke ndị na-eche ọnụ ụzọ nakọtara site nʼaka ndị mmadụ. 5Gwa ha ka ha nyefee ya nʼaka ndị ikom ahọpụtara maka ilekọta ọrụ nʼụlọnsọ ahụ. Ka ndị ikom a kwụọ ndị ọrụ na-arụzi ụlọnsọ Onyenwe anyị ụgwọ ọrụ, 6ya bụ, inye ya ndị ọkpọ ǹtu, ndị na-ewu ụlọ, na ndị na-edo nkume ụlọ. Ha jirikwa ego ahụ zụta osisi na nkume a wara awa, maka i ji dozie ụlọnsọ ahụ. 7Ọ dịghị mkpa ka ha gụzie otu ha si mefuo ego nke e nyefere ha nʼaka, nʼihi na ọrụ ha egosila na ha kwesiri ntụkwasị obi.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.