Native Bible

2 Kings 21:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O wuru ebe ịchụ aja dị iche iche, nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị, nke Onyenwe anyị, kwuru okwu banyere ya sị, “Ọ bụ na Jerusalem ka m ga-etinye Aha m.”

2 Kings 21:4 in English

2 Kings 21:4 · Berean Standard Bible

Manasseh also built altars in the house of the LORD, of which the LORD had said, “In Jerusalem I will put My Name.”

Context

2O mere ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị, site nʼịgbaso ihe arụ niile nke ndị mba ọzọ bi nʼala ahụ na mbụ mere, bụ ndị Onyenwe anyị chụpụrụ nʼihu ndị Izrel. 3O wugharịrị ebe dị elu niile nke nna ya Hezekaya lara nʼiyi. O wukwara ebe ịchụ aja dị iche iche nye Baal, pịakwa ogidi Ashera, dịka Ehab eze Izrel mere. Ọ kpọrọ isiala nye usuu ihe niile nke dị na mbara eluigwe,* feekwa ha ofufe. 4O wuru ebe ịchụ aja dị iche iche, nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị, nke Onyenwe anyị, kwuru okwu banyere ya sị, “Ọ bụ na Jerusalem ka m ga-etinye Aha m.” 5O wuru ebe ịchụ aja nye usuu ihe niile dị na mbara eluigwe,* nʼogige abụọ nke nʼụlọnsọ Onyenwe anyị. 6O jikwa nwa ya nwoke chụọ aja nʼime ọkụ, ọ gbara aja, chọọ ọsịsa nʼaka ndị mgbaasị, jụta ase nʼaka ndị na-ajụ mmụọ ọjọọ ase, ya na ndị dibịa afa mekọkwara ihe. O mere ihe dị njọ nʼebe ọ dị ukwuu nʼanya Onyenwe anyị, si otu a kpasuo ya iwe.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.