2 Ndị Eze 2:9
2 Kings 2:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ha abụọ gafesịrị, Ịlaịja jụrụ Ịlaisha ajụjụ sị ya, “Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị tupu e site nʼebe ị nọ wepụ m?” Ịlaisha rịọrọ sị ya, “Biko, mee ka m nweta ụdị mmụọ i nwere okpukpu abụọ.”
2 Kings 2:9 in English
2 Kings 2:9 · Berean Standard Bible
After they had crossed over, Elijah said to Elisha, “Tell me, what can I do for you before I am taken away from you?” “Please, let me inherit a double portion of your spirit,” Elisha replied.
Context
7Iri ndị amụma ise sitere nʼetiti ndị amụma sooro ha guzoro nʼebe dị anya na ncherita ihu ebe Ịlaịja na Ịlaisha kwụsịrị nʼakụkụ Jọdan. 8Mgbe ahụ, Ịlaịja chịịrị uwe mwụda ya, pịakọtaa ya, tie ya nʼelu osimiri ahụ. Mmiri ahụ kewara ụzọ abụọ, ala akọrọ pụtakwara. Nʼebe ahụ ka Ịlaịja na Ịlaisha si gafee nʼofe ọzọ nke osimiri ahụ. 9Mgbe ha abụọ gafesịrị, Ịlaịja jụrụ Ịlaisha ajụjụ sị ya, “Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị tupu e site nʼebe ị nọ wepụ m?”
Ịlaisha rịọrọ sị ya, “Biko, mee ka m nweta ụdị mmụọ i nwere okpukpu abụọ.” 10Ịlaịja zara sị ya, “Ihe ị rịọrọ bụ ihe sịrị ike omume. Ọ bụrụ na ị hụ m mgbe a na-ewepụ m site nʼebe ị nọ, ị ga-enweta ihe ị rịọrọ. Ma ọ bụrụ na ị hụghị m, ị gaghị enweta ihe ị rịọrọ.” 11Mgbe ha na-aga nʼihu nʼije ha na-akparịta ụka, na mberede, ụgbọ ọkụ nke ịnyịnya ọkụ na-adọkpụ pụtara ihe kewaa ha abụọ. Mgbe ahụ kwa oke ifufe buuru Ịlaịja rigoro nʼeluigwe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.