Native Bible

2 Kings 19:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ndị ozi eze Hezekaya bịakwutere Aịzaya,

2 Kings 19:5 in English

2 Kings 19:5 · Berean Standard Bible

So the servants of King Hezekiah went to Isaiah,

Context

3Ha sịrị ya, “Otu a ka Hezekaya sịrị, Ụbọchị taa bụ ụbọchị ahụhụ, na ịba mba na nke ihe ihere. Ụbọchị jọgburu onwe ya dịka ụbọchị nwanyị nọ nʼoke ihe mgbu nke ịmụ nwa ma ike adịkwaghị o ji amụpụta nwa ya. 4Ma eleghị anya Onyenwe anyị Chineke gị, ga-anụ okwu ahụ niile nke Rabashaka bụ ọchịagha, onye nna ya ukwu bụ eze Asịrịa, zitere ịkwa Chineke dị ndụ emo. Eleghị anya Onyenwe anyị Chineke gị ga-abara ya mba nʼihi okwu ndị a niile o kwuru, bụ ndị ọ nụrụ. Ya mere, kpeere anyị ekpere, anyị bụ ndị fọdụrụ ndụ.” 5Mgbe ndị ozi eze Hezekaya bịakwutere Aịzaya, 6ọ sịrị ha, “Otu a ka unu ga-asị nna unu ukwu, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, Atụla egwu nʼihi okwu niile nke ị nụrụ, bụ nke ndị na-ejere eze Asịrịa ozi ji kwuluo m. 7Gee ntị, mgbe ọ nụrụ akụkọ dị aṅaa, aga m eme ka ọ chọọ ịlaghachi nʼobodo nke aka ya. Nʼebe ahụ ka m ga-emekwa ka e jiri mma agha gbuo ya.’ ”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.