2 Ndị Eze 19:14
2 Kings 19:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe Hezekaya natara akwụkwọ ozi a site nʼaka ndị ozi ahụ, gụọ ya, o weere ya gaa nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị, gbasaa ya nʼihu Onyenwe anyị.
2 Kings 19:14 in English
2 Kings 19:14 · Berean Standard Bible
So Hezekiah received the letter from the messengers, read it, and went up to the house of the LORD and spread it out before the LORD.
Context
12Chi niile nke mba niile ndị ahụ nna nna m ha lara nʼiyi, ha napụtara ha, bụ chi ndị Gozan, Haran, Rezef na nke ndị Eden, ndị nọ na Tel Asa? 13Olee ebe eze ndị Hamat maọbụ eze Apad nọ? Olee ebe eze obodo Lair, Sefavaim, Hena na Iva nọkwa?” 14Mgbe Hezekaya natara akwụkwọ ozi a site nʼaka ndị ozi ahụ, gụọ ya, o weere ya gaa nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị, gbasaa ya nʼihu Onyenwe anyị. 15Hezekaya kpere ekpere nye Onyenwe anyị, sị, “O, Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel, onye ocheeze ya dị nʼetiti ndị cherubim, naanị gị bụ Chineke na-achị alaeze niile nke ụwa. Ọ bụkwa naanị gị kere eluigwe na ụwa. 16Tọọ ntị gị nʼala, o Onyenwe anyị ma nụrụ; meghee anya gị abụọ Onyenwe anyị, ka ịhụ; gee ntị nụkwa okwu ndị ahụ Senakerib zitere, nke o ji ekwulu Chineke dị ndụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.