Native Bible

2 Kings 18:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼoge ahụ, Hezekaya bụ eze Juda, nyakapụtachara ọlaedo niile o ji techie ibo na ibo ọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, chịrị ihe ndị a niile nye eze Asịrịa.

2 Kings 18:16 in English

2 Kings 18:16 · Berean Standard Bible

At that time Hezekiah stripped the gold with which he had plated the doors and doorposts of the temple of the LORD, and he gave it to the king of Assyria.

Context

14Mgbe ahụ, Hezekaya chọrọ ụzọ ọ ga-esi mee udo, zie ozi zigara eze Asịrịa nʼobodo Lakish sị ya, “Emehiela m, biko, site nʼala m pụọ. Aga m akwụ gị ihe ọbụla ị chọrọ nʼaka m.” Eze Asịrịa sitere nʼaka Hezekaya eze Juda nara narị talenti ọlaọcha atọ, na iri talenti ọlaedo atọ. 15Hezekaya chịịrị ọlaọcha niile ọ chọtara nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na akụ niile dị nʼụlọeze, nye ya eze Asịrịa. 16Nʼoge ahụ, Hezekaya bụ eze Juda, nyakapụtachara ọlaedo niile o ji techie ibo na ibo ọnụ ụzọ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, chịrị ihe ndị a niile nye eze Asịrịa. 17Eze Asịrịa sitere na Lakish zipụ ọchịagha* onye ọkwa ya kasị ukwuu, onyeisi ndị na-eje ozi na ọchịagha ya na usuu ndị agha ka ha jekwuru Hezekaya na Jerusalem. Ndị agha a bịaruru Jerusalem kwụsị nʼakụkụ olulu warawara* e gwuru ebe Ọdọ mmiri dị elu si nʼasọfe, nʼụzọ e si aga obosara ala ndị na-asụ akwa. 18Mgbe ha kpọrọ eze oku ka ọ bịa, Eliakịm nwa Hilkaya, onye nlekọta ụlọeze, na Shebna, ode akwụkwọ eze, na Joa nwa Asaf, onye ndekọ akụkọ ihe mere, pụrụ jekwuru ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.