2 Ndị Eze 17:35
2 Kings 17:35 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe Onyenwe anyị na ndị Izrel gbara ndụ, o nyere ha iwu sị, “Unu atụkwala chi ọzọ ọbụla egwu, maọbụ kpọọ isiala nye ha. Unu efela ha ofufe maọbụ chụọ aja nye ha.
2 Kings 17:35 in English
2 Kings 17:35 · Berean Standard Bible
For the LORD had made a covenant with the Israelites and commanded them, “Do not worship other gods or bow down to them; do not serve them or sacrifice to them.
Context
33Ha na-atụ egwu Onyenwe anyị ma ha gara nʼihu na-efe chi nke aka ha dịka omenaala mba ebe ndị e si dọta ha nʼagha si dị. 34Ruo taa, ha na-anọgidesi ike nʼife ofufe dịka ụzọ ochie ha si dị. Ha adịghị atụ egwu Onyenwe anyị, maọbụ mee dịka ụkpụrụ na iwu niile, maọbụ dịka ntụziaka na ihe niile enyere nʼiwu si dị, bụ nke Onyenwe anyị nyere ụmụ Jekọb, onye ọ kpọrọ Izrel. 35Mgbe Onyenwe anyị na ndị Izrel gbara ndụ, o nyere ha iwu sị, “Unu atụkwala chi ọzọ ọbụla egwu, maọbụ kpọọ isiala nye ha. Unu efela ha ofufe maọbụ chụọ aja nye ha. 36Ma Onyenwe anyị, onye ji ike dị ukwuu, na aka dị ike e setịpụrụ esetipụ kpọpụta unu site nʼala Ijipt, bụ naanị onye unu ga-atụ egwu. Ya ka unu ga-akpọ isiala nye, ya ka unu ga-achụrụ aja. 37Unu ga-elezi anya hụ na unu debere ụkpụrụ na iwu niile, ntụziaka na ihe niile enyere nʼiwu ndị a e depụtara nʼakwụkwọ nye unu. Unu atụkwala egwu* chi ndị ọzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.