Native Bible

2 Kings 17:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ndị Juda jụkwara idebe ihe niile Onyenwe anyị bụ Chineke ha nyere ha nʼiwu. Ha sooro omume ọjọọ ndị Izrel webatara.

2 Kings 17:19 in English

2 Kings 17:19 · Berean Standard Bible

and even Judah did not keep the commandments of the LORD their God, but lived according to the customs Israel had introduced.

Context

17Ha jiri ụmụ ha ndị ikom na ụmụ ha ndị inyom chụọ aja nsure ọkụ nye chi ndị mba ọzọ. Ha gakwara nʼaja ịjụ ase, na ịgba aja, si otu a nyefee onwe ha nʼaka ime ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị, si otu a kpasuo ya iwe. 18Ya mere, Onyenwe anyị wesoro Izrel iwe nke ukwuu, wezuga ha site nʼihu ya. Ọ dịkwaghị onye o kwere ka ọ fọdụ, karịakwa naanị ebo Juda.* 19Ma ndị Juda jụkwara idebe ihe niile Onyenwe anyị bụ Chineke ha nyere ha nʼiwu. Ha sooro omume ọjọọ ndị Izrel webatara. 20Nʼihi nke a, Onyenwe anyị jụrụ ndị Izrel niile. Ọ tara ha ahụhụ site nʼinyefe ha nʼaka ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike tutu ruo mgbe o mere ka e site nʼihu ya wezuga ha. 21Mgbe Onyenwe anyị mere ka ndị Izrel dọwapụ onwe ha site nʼalaeze Devid, ha mere Jeroboam nwa Nebat, eze ha. Ma Jeroboam mere ka Izrel site nʼiso Onyenwe anyị wezuga onwe ha. O mere ka ha mee mmehie dị ukwuu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.