Native Bible

2 Kings 16:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ gbasoro ụzọ niile nke ndị eze Izrel, ọbụladị i ji nwa ya nwoke chụọ aja nʼọkụ. Ọ gbasoro omenaala niile rụrụ arụ nke ndị mba ọzọ, ndị ahụ Onyenwe anyị chụpụrụ site nʼihu ndị Izrel.

2 Kings 16:3 in English

2 Kings 16:3 · Berean Standard Bible

Instead, he walked in the ways of the kings of Israel and even sacrificed his son in the fire,* according to the abominations of the nations that the LORD had driven out before the Israelites.

Context

1Ehaz* nwa Jotam, malitere ịbụ eze Juda nʼafọ nke iri na asaa nke ọchịchị eze Peka nwa Remalaya eze Izrel. 2Ehaz gbara iri afọ abụọ mgbe ọ malitere ịbụ eze. Afọ iri na isii ka ọ chịkwara nʼime Jerusalem, ma o meghị ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị bụ Chineke ya, dịka nna ya Devid mere. 3Ọ gbasoro ụzọ niile nke ndị eze Izrel, ọbụladị i ji nwa ya nwoke chụọ aja nʼọkụ. Ọ gbasoro omenaala niile rụrụ arụ nke ndị mba ọzọ, ndị ahụ Onyenwe anyị chụpụrụ site nʼihu ndị Izrel. 4Ọ chụrụ aja surekwaa ihe nsure ọkụ aja na-esi isi ụtọ nʼebe niile dị elu, nʼelu ugwu niile, na nʼokpuru osisi ndụ ọbụla. 5Mgbe ahụ, Rezin eze Aram na Peka nwa Remalaya, eze Izrel rigooro ịga buso Jerusalem agha, gbakwaa Ehaz gburugburu. Ma ha emerighị ya nʼagha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.