Native Bible

2 Kings 15:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma Pekahaya mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị. O sighị na mmehie niile nke Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe ya, bụ nke o jiri mee ka Izrel mehie.

2 Kings 15:24 in English

2 Kings 15:24 · Berean Standard Bible

And he did evil in the sight of the LORD and did not turn away from the sins that Jeroboam son of Nebat had caused Israel to commit.

Context

22Menahem sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, Pekahaya nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya. 23Nʼafọ nke iri ise, nke ọchịchị eze Azaraya na Juda, ka Pekahaya nwa Menahem bidoro ịchị dịka eze nʼIzrel. Afọ abụọ ka ọ chịrị nʼime Sameria. 24Ma Pekahaya mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị. O sighị na mmehie niile nke Jeroboam nwa Nebat wezuga onwe ya, bụ nke o jiri mee ka Izrel mehie. 25Ma Peka nwa Remalaya, otu nʼime ndịisi agha eze na iri ndị ikom ise ọzọ si Gilead gbara izu megide ya, gbuo ya nʼụlọeze dị nʼime Sameria. Ha gbukwara Agob na Arie nʼoge a ha gburu Pekahaya. Emesịa, Peka ghọrọ eze nʼọnọdụ ya. 26Akụkọ banyere Pekahaya na ihe niile o mere ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Izrel mere nʼụbọchị ndụ ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.