Native Bible

2 Kings 14:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ wezugaghị ebe ịchụ aja niile dị nʼugwu. Ndị Juda gara nʼihu na-achụ aja na-esurekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ugwu ahụ niile.

2 Kings 14:4 in English

2 Kings 14:4 · Berean Standard Bible

Nevertheless, the high places were not taken away, and the people continued sacrificing and burning incense on the high places.

Context

2Amazaya gbara iri afọ abụọ na ise mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ bụ eze na Jerusalem iri afọ abụọ na itoolu. Aha nne ya bụ Jehoadin, onye Jerusalem. 3O mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị, ma o meghị dịka nna nna ya bụ Devid mere. Nʼihe niile, ọ gbasoro nzọ ụkwụ nna ya Joash. 4Ọ wezugaghị ebe ịchụ aja niile dị nʼugwu. Ndị Juda gara nʼihu na-achụ aja na-esurekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ugwu ahụ niile. 5Mgbe alaeze ahụ siri ike nʼọchịchị ya, o gburu ndị ozi ahụ gburu eze, bụ nna ya. 6Ma o meghị ka ụmụ ndị ogbu mmadụ ahụ nwụọ, nʼusoro ihe e dere nʼakwụkwọ iwu Mosis, ebe Onyenwe anyị nyere iwu sị: “Agaghị eme ka ndị mụrụ ụmụ nwụọ nʼihi ihe ụmụ ha metara, maọbụ mee ka ụmụ nwụọ nʼihi ihe ndị mụrụ ha metara, onye ọbụla ga-anwụ nʼihi mmehie nke aka ya.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.