2 Ndị Eze 14:1
2 Kings 14:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼafọ nke abụọ nke ịbụ eze Jehoash nwa Jehoahaz nʼIzrel, ka Amazaya nwa Joash eze Juda malitere ọchịchị ya.
2 Kings 14:1 in English
2 Kings 14:1 · Berean Standard Bible
In the second year of the reign of Jehoash * son of Jehoahaz over Israel, Amaziah son of Joash became king of Judah.
Context
1Nʼafọ nke abụọ nke ịbụ eze Jehoash nwa Jehoahaz nʼIzrel, ka Amazaya nwa Joash eze Juda malitere ọchịchị ya. 2Amazaya gbara iri afọ abụọ na ise mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ bụ eze na Jerusalem iri afọ abụọ na itoolu. Aha nne ya bụ Jehoadin, onye Jerusalem. 3O mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị, ma o meghị dịka nna nna ya bụ Devid mere. Nʼihe niile, ọ gbasoro nzọ ụkwụ nna ya Joash.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.