Native Bible

2 Kings 13:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi nke a, iwe were Onyenwe anyị nke ukwuu megide Izrel. O mere ka ha nọrọ nʼokpuru ọchịchị Hazael eze Aram na Ben-Hadad nwa ya ogologo oge.

2 Kings 13:3 in English

2 Kings 13:3 · Berean Standard Bible

So the anger of the LORD burned against Israel, and He delivered them continually into the hands of Hazael king of Aram and his son Ben-hadad.

Context

1Nʼafọ nke iri abụọ na atọ nke ọchịchị eze Joash nwa Ahazaya na Juda, ka Jehoahaz nwa Jehu malitere ịbụ eze nʼIzrel nʼobodo Sameria. Ọ chịkwara na Sameria afọ iri na asaa. 2Kama Jehoahaz bụ eze ọjọọ. O mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị. O soro ụzọ ọjọọ niile nke Jeroboam nwa Nebat, onye dubara ndị Izrel na mmehie. 3Nʼihi nke a, iwe were Onyenwe anyị nke ukwuu megide Izrel. O mere ka ha nọrọ nʼokpuru ọchịchị Hazael eze Aram na Ben-Hadad nwa ya ogologo oge. 4Ma Jehoahaz kpere ekpere rịọọ Onyenwe anyị nʼoge a ka o nyere ya aka, Onyenwe anyị gere ya ntị, nʼihi na Chineke hụrụ mmegbu* nke eze Aram na-emegbu ndị Izrel. 5Onyenwe anyị họpụtaara Izrel onye nzọpụta, ha sitere nʼaka ike ndị Aram nwere onwe ha.* Izrel biri nʼụlọ nke aka ha dịka ha biiri nʼoge gara aga.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.