Native Bible

2 Kings 13:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Otu ụbọchị, mgbe ụfọdụ ndị ikom na-eli otu nwoke nwụrụ anwụ, ha hụrụ ndị a na-apụnara mmadụ ihe nʼike. Nʼihi nke a, ha mere ngwangwa site nʼụjọ tụbanye nwoke ahụ nʼili Ịlaisha. Mgbe ozu nwoke ahụ dara metụ ọkpụkpụ Ịlaisha ahụ, nwoke ahụ nwụrụ anwụ megharịrị ahụ bilie, guzo nʼụkwụ ya abụọ.

2 Kings 13:21 in English

2 Kings 13:21 · Berean Standard Bible

Once, as the Israelites were burying a man, suddenly they saw a band of raiders, so they threw the man’s body into Elisha’s tomb. And as soon as his body touched the bones of Elisha, the man was revived and stood up on his feet.

Context

19Ma onye nke Chineke ahụ were iwe sị ya, “Ị gaara apịa ya nʼala ugboro ise maọbụ isii. Mgbe ahụ, ị gaara enwe ike merie ndị Aram bibie ha kpamkpam. Ma ugbu a, ọ bụ naanị ugbo atọ ka ị ga-emeri ha.” 20Ya mere, Ịlaisha nwụrụ. E likwara ya. Nʼoge ahụ, ọtụtụ ndị na-apụnara mmadụ ihe nʼike na-esi nʼala ndị Moab na-abịa nʼala Izrel izu ohi site nʼọnwa nke atọ nʼafọ ọhụrụ ọbụla. 21Otu ụbọchị, mgbe ụfọdụ ndị ikom na-eli otu nwoke nwụrụ anwụ, ha hụrụ ndị a na-apụnara mmadụ ihe nʼike. Nʼihi nke a, ha mere ngwangwa site nʼụjọ tụbanye nwoke ahụ nʼili Ịlaisha. Mgbe ozu nwoke ahụ dara metụ ọkpụkpụ Ịlaisha ahụ, nwoke ahụ nwụrụ anwụ megharịrị ahụ bilie, guzo nʼụkwụ ya abụọ. 22Hazael, eze Aram, busoro Izrel agha ụbọchị niile nke ndụ Jehoahaz eze Izrel. 23Ma Onyenwe anyị meere ha amara, nwee ọmịiko nʼebe ha nọ, ma gosikwa ha na ihe banyere ha na-emetụ ya nʼobi nʼihi ọgbụgba ndụ ya na Ebraham na Aịzik na Jekọb. Ruo taa, o kweghị ka e bibie ha, maọbụ ka e site nʼihu ya chụpụ ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.