Native Bible

2 Kings 12:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma naanị na o wezugaghị ebe ịchụ aja niile dị nʼugwu. Ndị Juda nọgidere na-achụ aja dị iche iche nʼebe ahụ, na-esurekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ.

2 Kings 12:3 in English

2 Kings 12:3 · Berean Standard Bible

Nevertheless, the high places were not removed; the people continued sacrificing and burning incense there.

Context

1Nʼafọ nke asaa, nke ọchịchị Jehu nʼIzrel, ka Joash malitere ịbụ eze na Juda. Iri afọ anọ ka ọ chịrị dịka eze na Jerusalem. Aha nne ya bụ Zibịa onye Bịasheba. 2Joash mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị ụbọchị niile nke Jehoiada onye nchụaja ziri ya ihe. 3Ma naanị na o wezugaghị ebe ịchụ aja niile dị nʼugwu. Ndị Juda nọgidere na-achụ aja dị iche iche nʼebe ahụ, na-esurekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. 4Joash sịrị ndị nchụaja, “Nakọtaanụ ego niile a na-ewebata dịka onyinye dị nsọ nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ya bụ, ego a na-anakọta nʼoge ịgụ mmadụ ọnụ, na ego e webatara maka imezu nkwa ndị mmadụ kwere, na ego e webatara nʼụlọnsọ ukwu dịka onyinye afọ ofufe. 5Ka onye nchụaja ọbụla site nʼaka otu nʼime ndị na-eche ego nara ego, a ga-eji mezie ihe ọbụla a chọpụtara na o mebiri nʼụlọnsọ ukwu ahụ.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.