2 Ndị Eze 12:18
2 Kings 12:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Joash, bụ eze Juda, chịkọtara ihe niile ahụ bụ nke Jehoshafat, Jehoram na Ahazaya nna ya, ndị bụ eze Juda doro nsọ nye Chineke, chịrịkwa onyinye nke ya onwe ya dokwara nsọ, na ọlaedo niile, na akụ niile e nwere ike ịchọta nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, na nke dị nʼụlọeze, zigara Hazael, bụ eze Aram. Nʼihi ihe ndị a, ọ lara, hapụ ibuso Jerusalem agha.
2 Kings 12:18 in English
2 Kings 12:18 · Berean Standard Bible
So King Joash of Judah took all the sacred objects dedicated by his fathers—Jehoshaphat, Jehoram, and Ahaziah, the kings of Judah—along with his own consecrated items and all the gold found in the treasuries of the house of the LORD and the royal palace, and he sent them to Hazael king of Aram. So Hazael withdrew from Jerusalem.
Context
16E webataghị ego niile sitere nʼaja ikpe ọmụma nakwa aja mmehie nʼime ụlọnsọ ukwuu Onyenwe anyị. Ọ bụ ndị nchụaja nwe nke ahụ. 17Nʼoge ahụ, Hazael eze Aram, gara buso Gat agha, lụgbuo ya, dọta ya nʼagha. Emesịa, o chere ihu nʼụzọ Jerusalem imegide ya. 18Ma Joash, bụ eze Juda, chịkọtara ihe niile ahụ bụ nke Jehoshafat, Jehoram na Ahazaya nna ya, ndị bụ eze Juda doro nsọ nye Chineke, chịrịkwa onyinye nke ya onwe ya dokwara nsọ, na ọlaedo niile, na akụ niile e nwere ike ịchọta nʼụlọnsọ Onyenwe anyị, na nke dị nʼụlọeze, zigara Hazael, bụ eze Aram. Nʼihi ihe ndị a, ọ lara, hapụ ibuso Jerusalem agha. 19Akụkọ gbasara ọchịchị eze Joash, na ihe niile o mere, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe ndị eze Juda niile mere nʼoge ha. 20Ndị ozi ya gbara izu ọjọọ megide Joash, gbukwaa ya na Bet Milo, nʼụzọ e si aga Sila.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.