2 Ndị Eze 10:32
2 Kings 10:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼoge ahụ, Onyenwe anyị malitere ime ka ndị Izrel bido ịdị nta. Hazael eze Aram, buru agha merie ọtụtụ akụkụ Izrel,
2 Kings 10:32 in English
2 Kings 10:32 · Berean Standard Bible
In those days the LORD began to reduce the size of Israel. Hazael defeated the Israelites throughout their territory
Context
30Onyenwe anyị gwara Jehu sị, “Nʼihi na i mere nke ọma mezuo ihe niile ziri ezi nʼanya m, nʼebe ezinaụlọ Ehab nọ, nʼusoro ihe niile dị nʼuche m ime, ụmụ ụmụ gị ga-anọkwasị nʼocheeze Izrel, ruo nʼọgbọ nke anọ ha.” 31Ma Jehu akpachapụghị anya iji obi ya niile debe iwu Onyenwe anyị, Chineke Izrel. O siteghị na mmehie Jeroboam wezuga onwe ya, bụ mmehie ahụ o mere ka Izrel mee. 32Nʼoge ahụ, Onyenwe anyị malitere ime ka ndị Izrel bido ịdị nta. Hazael eze Aram, buru agha merie ọtụtụ akụkụ Izrel, 33nke dị nʼọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan, na ala niile nke Gilead (nʼoke ala ndị Gad, na nke ndị Ruben, na Manase), site nʼAroea nke dị nʼakụkụ ndagwurugwu Anọn, ruo Gilead na Bashan. 34Akụkọ gbasara ọchịchị eze Jehu, na ihe niile o mere, na ịkpa ike ya niile, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Izrel?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.