2 Ndị Eze 10:20
2 Kings 10:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Jehu sịrị, “Kpọsaanụ na a ga-enwe oke mkpọkọta dị nsọ nye Baal.” Ya mere, ha kwusara ya.
2 Kings 10:20 in English
2 Kings 10:20 · Berean Standard Bible
And Jehu commanded, “Proclaim a solemn assembly for Baal.” So they announced it.
Context
18Emesịa, Jehu kpọkọtara ndị obodo ahụ niile sị ha, “Ehab fere Baal ofufe nke nta, Jehu ga-efe ya ebe ọ dị ukwuu. 19Ugbu a, kpọkọtaanụ ndị amụma Baal niile, ndị niile na-efe ya, na ndị nchụaja ya niile. Hụnụ na onye ọbụla nʼime ha bịara, nʼihi na a ga-eme oke mmemme ịchụ aja nye Baal. Onye ọbụla e lere anya ya nʼebe ahụ, ma a hụghị ya, agaghị adị ndụ.” Ma Jehu ji aghụghọ nʼihi ka ọ laa ndị a na-efe Baal nʼiyi. 20Jehu sịrị, “Kpọsaanụ na a ga-enwe oke mkpọkọta dị nsọ nye Baal.” Ya mere, ha kwusara ya. 21O zipụrụ ozi nye ndị bi nʼakụkụ Izrel niile. Ndị niile na-efe Baal bịazuru. Ọ dịghị onye fọdụrụ nke na-abịaghị. Ha jupụtara nʼụlọnsọ ukwu Baal* site nʼotu isi ya ruo nʼisi nke ọzọ. 22Jehu sịrị onye na-elekọta ụlọ ebe a na-edebe uwe ndị na-efe ofufe na-eyi, “Chịpụta uwe nye ndị niile na-efe Baal.” Ya mere, ọ chịpụtaara ha uwe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.