2 Ndị Eze 1:11
2 Kings 1:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọzọkwa, eze zigara otu onyeisi agha na iri ndị agha ise ọzọ ka ha gaa jide Ịlaịja. Mgbe ha bịarutere hụ Ịlaịja, onyeisi agha ahụ kpọkuru ya sị ya, “Onye nke Chineke, eze sị gị, ‘rituo, bịa ngwangwa!’ ”
2 Kings 1:11 in English
2 Kings 1:11 · Berean Standard Bible
So the king sent to Elijah another captain with his fifty men. And the captain said to Elijah, “Man of God, the king declares, ‘Come down at once!’”
Context
9Mgbe ahụ, eze zigara otu onyeisi agha ya, na iri ndị agha ise ka ha gaa jide Ịlaịja. Mgbe ndị agha ahụ bịarutere hụ Ịlaịja ka ọ nọ ala nʼelu ugwu, onyeisi agha ahụ kpọrọ Ịlaịja sị ya, “Onye nke Chineke, eze sị gị, ‘rituo!’ ” 10Ịlaịja zara sị ha, “Ọ bụrụ na m bụ onye nke Chineke dịka i kwuru, ka ọkụ si nʼeluigwe daa rechapụ gị na iri ndị a agha ise so gị.” Otu mgbe ahụ, ọkụ sitere nʼeluigwe daa rechapụ iri ndị agha ise ahụ na onyeisi ha. 11Ọzọkwa, eze zigara otu onyeisi agha na iri ndị agha ise ọzọ ka ha gaa jide Ịlaịja. Mgbe ha bịarutere hụ Ịlaịja, onyeisi agha ahụ kpọkuru ya sị ya, “Onye nke Chineke, eze sị gị, ‘rituo, bịa ngwangwa!’ ” 12Ịlaịja zara sị ya, “Ọ bụrụ na m bụ onye nke Chineke dịka i kwuru, ka ọkụ si nʼeluigwe daa rechapụ gị na iri ndị agha ise gị na ha so.” Ngwangwa, ọkụ Chineke si nʼeluigwe daa rechapụ ha. 13Ọzọkwa, eze zigara otu onyeisi agha na iri ndị agha ise ọzọ ka ha gaa jide Ịlaịja. Mgbe ndị agha a bịara hụ Ịlaịja, onyeisi agha ahụ rigoro nʼelu ugwu gbuo ikpere nʼala nʼihu Ịlaịja rịọọ ya amara sị ya, “Onye nke Chineke, biko, meere ohu gị na iri ndị agha ise mụ na ha so ebere.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.