2 Jọn 1:6
2 John 1:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nke a bụ ịhụnanya ahụ: ka anyị na-ejegharị nʼirube isi nʼiwu ya niile. Dịka unu si nụ ya site na mmalite, unu ahapụkwala ijegharị nʼime ya.
2 John 1:6 in English
2 John 1:6 · Berean Standard Bible
And this is love, that we walk according to His commandments. This is the very commandment you have heard from the beginning, that you must walk in love.
Context
4Apụghị m ịkọ ụdị aṅụrị m nwere mgbe m hụrụ na ụfọdụ ụmụ gị na-ebi ndụ ịgbaso eziokwu dịka ihe Nna nyere anyị nʼiwu. 5Ma ugbu a, ezi nwanyị, ọ bụghị iwu ọhụrụ ka m na-edere gị kama nke ahụ e nyere anyị site na mmalite. Ana m arịọ ka anyị hụrịta ibe anyị nʼanya. 6Nke a bụ ịhụnanya ahụ: ka anyị na-ejegharị nʼirube isi nʼiwu ya niile. Dịka unu si nụ ya site na mmalite, unu ahapụkwala ijegharị nʼime ya. 7Nʼihi na ọtụtụ ndị nduhie apụọla baa nʼụwa, bụ ndị na-adịghị ekwenye na Jisọs Kraịst bịara nʼoyiyi mmadụ. Onye ọbụla dị otu a bụ onye nduhie bụrụkwa onye na-emegide Kraịst. 8Lezienụ anya, ka unu ghara itufu ụgwọ ọrụ nke anyị dọgburu onwe anyị nʼọrụ maka ya, kama ka unu nata ụgwọ ọrụ unu nʼuju.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.