Native Bible

2 Corinthians 8:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, anyị rịọrọ Taịtọs, onye malitere ọrụ ka ọ rụzuo ọrụ amara ahụ ruo nʼisi.

2 Corinthians 8:6 in English

2 Corinthians 8:6 · Berean Standard Bible

So we urged Titus to help complete your act of grace, just as he had started it.

Context

4Nʼezie, ha rịọsiri anyị arịrịọ ike ka anyị nara onyinye amara ha nyere nʼihi iso keta oke inyere ndị nsọ ndị ọzọ nọ na mkpa aka. 5Nke ka nke, ha nyere karịa ihe anyị lere anya na ha ga-enye. Nʼihi na ha buru ụzọ were onwe ha nye Onyenwe anyị. Ha sitekwara nʼọchịchọ Chineke nyekwa anyị onwe ha. 6Ya mere, anyị rịọrọ Taịtọs, onye malitere ọrụ ka ọ rụzuo ọrụ amara ahụ ruo nʼisi. 7Ma ebe unu babigara ụba oke nʼihe niile unu nwere, nʼokwukwe, na okwu, nʼihe ọmụma, na ịnụ ọkụ nʼobi, na ịhụnanya unu hụrụ anyị, lezie unu anya hụ na unu babigakwara ụba oke nʼamara nke inye ihe a. 8Anaghị m enye unu iwu, kama site nʼizi unu otu o si na-anụ ndị ọzọ ọkụ nʼobi inyeaka, achọrọ m ịchọpụta ma ịhụnanya unu na ịnụ ọkụ nʼobi unu ọ ga-adakọtakwa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.