2 Ndị Kọrint 8:18
2 Corinthians 8:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Anyị na-ezitekwa ya na nwanna anyị onye ahụ nzukọ niile na-asọpụrụ nʼihi ọrụ ikwusa oziọma ahụ.
2 Corinthians 8:18 in English
2 Corinthians 8:18 · Berean Standard Bible
Along with Titus we are sending the brother who is praised by all the churches for his work in the gospel.
Context
16Ekelere m Chineke onye tinyere nʼobi Taịtọs otu ịnụ ọkụ ahụ banyere unu ekele, dịka o si emetụ m nʼobi. 17Ọ bụghị naanị na o kweere ime dịka anyị si rịọrọ ya, kama nʼihi ịhụnanya o nwere nʼebe unu nọ, o kpebiri nʼime obi ya ịbịakwute unu na inyere unu aka. 18Anyị na-ezitekwa ya na nwanna anyị onye ahụ nzukọ niile na-asọpụrụ nʼihi ọrụ ikwusa oziọma ahụ. 19Ma ọ bụghị naanị nke a, kama nzukọ họpụtara ya iso anyị, na inyere anyị aka dịka anyị na-ebu onyinye a, bụ ije ozi anyị na-eje nʼihi iwetara Onyenwe anyị otuto, na izipụta njikere anyị inyere ibe anyị aka. 20Anyị na-eze ka onye ọbụla ghara ịta anyị ụta nʼihe ọbụla, nʼihi ụzọ anyị si jee ozi gbasara onyinye mgbasapụ aka a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.