2 Ndị Kọrint 7:5
2 Corinthians 7:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na mgbe anyị batara Masidonia, anyị enweghị izuike ma ọlị. Kama mkpagbu si nʼaka nri na aka ekpe bịakwute anyị, ọgụ nʼezi, egwu nʼime.
2 Corinthians 7:5 in English
2 Corinthians 7:5 · Berean Standard Bible
For when we arrived in Macedonia, our bodies had no rest, but we were pressed from every direction—conflicts on the outside, fears within.
Context
3Anaghị m ekwu ihe ndị a ka m maa unu ikpe, dịka m kwuburu na mbụ, na anyị bu unu nʼobi anyị, ịdịkọ ndụ, maọbụ ịnwụkọkwa ọnwụ nʼotu. 4Nkwuwa okwu m ji gwa unu okwu dị ukwuu; ịnya isi m nʼihi unu dịkwa ukwuu. Abụ m onye a gbara ume nʼebe ọ dị ukwu, nʼime ọnọdụ ahụhụ anyị niile, ana m aṅụrịbiga ọṅụ oke. 5Nʼihi na mgbe anyị batara Masidonia, anyị enweghị izuike ma ọlị. Kama mkpagbu si nʼaka nri na aka ekpe bịakwute anyị, ọgụ nʼezi, egwu nʼime. 6Ma otu ọ dị, Chineke, onye na-agba ndị ike gwụrụ ume, gbara anyị ume site nʼọbịbịa Taịtọs. 7Ọ bụkwaghị naanị nʼihi na ọbịbịa ọ bịara nyere anyị obi ụtọ, kama akụkọ o ji bịa, gbasara otu unu si gbaa ya ume, gwakwa anyị otu unu si na-ele anya ịhụ m, na otu unu si na-eru ụjụ nʼihi ihe niile mere, na otu unu si guzosie ike nʼukwu m, na ụdị ịhụnanya unu nwere nʼebe m nọ, obi tọrọ m ụtọ nke ukwuu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.