Native Bible

2 Corinthians 7:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Megheenụ obi unu nabata anyị, nʼihi na o nweghị onye ọbụla nʼetiti unu anyị mere ihe ọjọọ. O nwekwaghị onye anyị duhiere. Ọ dịkwaghị onye ọbụla anyị rigburu.

2 Corinthians 7:2 in English

2 Corinthians 7:2 · Berean Standard Bible

Make room for us in your hearts. We have wronged no one, we have corrupted no one, we have exploited no one.

Context

1Ya mere, ndị enyi m, ebe anyị nwere nkwa ndị a niile, ka anyị debe onwe anyị ọcha nʼime ihe niile ọbụla nke na-emerụ ahụ anyị na mmụọ anyị. Ka anyị mezuo ịdị nsọ nʼịtụ egwu Chineke. 2Megheenụ obi unu nabata anyị, nʼihi na o nweghị onye ọbụla nʼetiti unu anyị mere ihe ọjọọ. O nwekwaghị onye anyị duhiere. Ọ dịkwaghị onye ọbụla anyị rigburu. 3Anaghị m ekwu ihe ndị a ka m maa unu ikpe, dịka m kwuburu na mbụ, na anyị bu unu nʼobi anyị, ịdịkọ ndụ, maọbụ ịnwụkọkwa ọnwụ nʼotu. 4Nkwuwa okwu m ji gwa unu okwu dị ukwuu; ịnya isi m nʼihi unu dịkwa ukwuu. Abụ m onye a gbara ume nʼebe ọ dị ukwu, nʼime ọnọdụ ahụhụ anyị niile, ana m aṅụrịbiga ọṅụ oke.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.