2 Ndị Kọrint 7:14
2 Corinthians 7:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na tupu ọ hapụ anyị bịakwute unu, anyara m isi nʼihu ya banyere unu; ugbu a, obi dị m ụtọ nke ukwuu nʼihi na unu emeghị ka ihere mee m. Anyị ekwuola eziokwu nye unu. Ugbu a, ịnya isi m nʼebe Taịtọs nọ egosila na anyị bụ ndị eziokwu.
2 Corinthians 7:14 in English
2 Corinthians 7:14 · Berean Standard Bible
Indeed, I was not embarrassed by anything I had boasted to him about you. But just as everything we said to you was true, so our boasting to Titus has proved to be true as well.
Context
12Ọ bụ ezie na m deere unu akwụkwọ ahụ, ma edeghị m ya nʼihi onye ahụ mehiere, maọbụ nʼihi onye ahụ e mehiere megide. Kama edere m ya ime ka Chineke gosi unu otu ihe gbasara anyị si na-anụ unu ọkụ nʼobi. 13Nʼụzọ niile ndị a, anyị bụ ndị a gbara ume site nʼịhụnanya unu nwere nʼebe anyị nọ.
A gbara anyị ume karịa site na ịhụ ọṅụ Taịtọs nʼihi nnabata unu nabatara, na otu unu si mee ka mmụọ ya zuru ike mgbe ọ bịakwutere unu. 14Nʼihi na tupu ọ hapụ anyị bịakwute unu, anyara m isi nʼihu ya banyere unu; ugbu a, obi dị m ụtọ nke ukwuu nʼihi na unu emeghị ka ihere mee m. Anyị ekwuola eziokwu nye unu. Ugbu a, ịnya isi m nʼebe Taịtọs nọ egosila na anyị bụ ndị eziokwu. 15Ugbu a, ịhụnanya o nwere nʼebe unu nọ na-aba ụba nke ukwuu, nʼihi ncheta ọ na-echeta otu unu niile si jiri ọṅụ gee ya ntị na otu unu si jiri ịtụ egwu na ahụ ịma jijiji nabata ya. 16Nke a na-enyekwa m obi ụtọ nʼihi na enwere m ntụkwasị obi nʼebe unu nọ nʼime ihe niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.