Native Bible

2 Corinthians 6:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

sitekwa nʼikwu eziokwu na site nʼike Chineke. Anyị buru ezi omume dịka ngwa agha nʼaka nri na nʼaka ekpe.

2 Corinthians 6:7 in English

2 Corinthians 6:7 · Berean Standard Bible

in truthful speech and in the power of God; with the weapons of righteousness in the right hand and in the left;

Context

5A na-eti anyị ihe otiti ọtụtụ mgbe. E tinyekwala anyị nʼime ụlọ mkpọrọ dị iche iche. Ọtụtụ mgbe ka igwe mmadụ tikwara anyị ihe otiti. Anyị na-adọgbu onwe anyị nʼọrụ. Ọtụtụ abalị anyị nọkwara nʼime ịmụ anya na-erighị nri, 6nʼime ịdị ọcha na ezi nghọta na ntachiobi nke anyị nwere, nʼinwe obiọma na ezi ịhụnanya nke ihu abụọ nʼadịghị na ya nʼime Mmụọ Nsọ, 7sitekwa nʼikwu eziokwu na site nʼike Chineke. Anyị buru ezi omume dịka ngwa agha nʼaka nri na nʼaka ekpe. 8Ụfọdụ na-asọpụrụ anyị ma ndị ọzọ na-eme anyị ihe ihere. Ụfọdụ na-ata anyị ụta, ma ụfọdụ na-eto anyị. Ụfọdụ mmadụ na-agụ anyị dị ka ndị ụgha, ma anyị nọgidesịrị ike na-ekwu eziokwu. 9Ụwa amaghị anyị, ma a maara anyị. Ọ bụ ezie na anyị na ọnwụ na-anọ nso mgbe niile, ma lee anyị ka dịkwa ndụ. A na-ata anyị ahụhụ, ma lee anyị anwụghị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.