Native Bible

2 Corinthians 5:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ niile anyị nọ nʼime ụlọ ikwu a,* anyị na-anọgide nʼịsụ ude nke ibu arọ. Ọ bụghị nʼihi na anyị chọrọ ịnwụ anwụ bụrụ ndị na-enweghị anụ ahụ, kama ọ bụ nʼihi na anyị chọrọ ka e yikwasị anyị anụ ahụ nke eluigwe ahụ, ka anụ ahụ a pụrụ ịnwụ anwụ yikwasị ndụ ebighị ebi.

2 Corinthians 5:4 in English

2 Corinthians 5:4 · Berean Standard Bible

So while we are in this tent, we groan under our burdens, because we do not wish to be unclothed but clothed, so that our mortality may be swallowed up by life.

Context

2Ugbu a anyị nọ na-asụ ude, na-enwe agụụ inweta ebe obibi anyị dị nʼeluigwe. 3Ka ọ ga-abụ anyị yiri ya, ka anyị hapụ ịdị ka ndị gba ọtọ. 4Mgbe ahụ niile anyị nọ nʼime ụlọ ikwu a,* anyị na-anọgide nʼịsụ ude nke ibu arọ. Ọ bụghị nʼihi na anyị chọrọ ịnwụ anwụ bụrụ ndị na-enweghị anụ ahụ, kama ọ bụ nʼihi na anyị chọrọ ka e yikwasị anyị anụ ahụ nke eluigwe ahụ, ka anụ ahụ a pụrụ ịnwụ anwụ yikwasị ndụ ebighị ebi. 5Chineke onye ya onwe ya, bụ onye kwadobere anyị maka mgbanwo nke a, nyekwara anyị Mmụọ Nsọ ka ọ bụrụ onye ga-ahụ na anyị ga-enwetazu nkwa ahụ niile. 6Nʼihi nke a, anyị nwere obi ike mgbe niile, nʼihi na anyị maara na mgbe anyị na-aga nʼihu na-adị ndụ nʼanụ ahụ a, anyị na Onyenwe anyị anọghị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.