2 Ndị Kọrint 2:6
2 Corinthians 2:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na ntaramahụhụ unu niile kpebiri nye ya ezuola.
2 Corinthians 2:6 in English
2 Corinthians 2:6 · Berean Standard Bible
The punishment imposed on him by the majority is sufficient for him.
Context
4Eji m anya mmiri dị ukwuu na oke obi mgbu na obi mgbawa deere unu akwụkwọ, ọ bụghị ka m kpasuo unu iwe kama ka unu nwee ike ịmata oke ịhụnanya m nwere nʼebe unu nọ. 5Ọ bụrụ na onye ọbụla mere ihe butere obi mgbu, ka a hapụ ikwu ya karịa ka o kwesiri, ọ bụghị naanị m ka o wetaara obi mgbu, o wetakwaara unu niile obi mgbu. 6Nʼihi na ntaramahụhụ unu niile kpebiri nye ya ezuola. 7Ugbu a, bikonu ụmụnna m, o kwesiri ka unu gbaghara ya, ma kasịe ya obi, ka ọ hapụ inwe obi ilu maọbụ daa mba na mmụọ ya, rubiga ụjụ oke. 8Ya mere ana m arịọ unu, bikonu, gosinụ ya na unu hụrụ ya nnọọ nʼanya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.