Native Bible

2 Corinthians 12:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nke a bụ ugboro atọ m na-ejikere ịbịakwute unu. Agaghị m abụrụ unu ibu arọ, ihe dị m mkpa abụghị akụ unu nwere, kama unu onwe unu. Ọ bụghị ụmụntakịrị ka ọ dịrị ịkpadoro nne na nna ha ihe, kama ọ bụ ọrụ dịrị nne na nna ịkpadoro ụmụ ha ihe.

2 Corinthians 12:14 in English

2 Corinthians 12:14 · Berean Standard Bible

See, I am ready to come to you a third time, and I will not be a burden, because I am not seeking your possessions, but you. For children should not have to save up for their parents, but parents for their children.

Context

12Ejiri m ndidi rụọ ọrụ nʼetiti unu, ihe iji gosi na abụ m nwaazụ* nʼeziokwu. Egosiri m unu ihe ịrịbama, ọrụ ebube dị iche iche, na ọtụtụ oke ọrụ. 13Olee ụzọ unu si dị ala nʼebe chọọchị ndị ọzọ dị, ma ọ bụghị na m abụghị ibu arọ nye unu? Gbagharanụ m mmejọ a. 14Nke a bụ ugboro atọ m na-ejikere ịbịakwute unu. Agaghị m abụrụ unu ibu arọ, ihe dị m mkpa abụghị akụ unu nwere, kama unu onwe unu. Ọ bụghị ụmụntakịrị ka ọ dịrị ịkpadoro nne na nna ha ihe, kama ọ bụ ọrụ dịrị nne na nna ịkpadoro ụmụ ha ihe. 15Nʼezie, ọ na-atọ m ụtọ iwere onwe m na ihe niile m nwere nye unu, nʼihi na ahụrụ m unu nʼanya. Ma ọ bụrụ na m hụrụ unu nʼanya karịa, ọ ga-adị mma ma unu hụ m nʼanya nke nta? 16Nʼagbanyeghị na-abụrụ m unu ibu arọ, ụfọdụ nʼime unu na-ekwu, ọ bụ ezie na ọ dịghị anara anyị ihe ọbụla, maọbụ onye aghụghọ. Ma eleghị anya, o nwere ụzọ aghụghọ dị iche iche o si anara anyị ihe.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.