Native Bible

2 Corinthians 12:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụ nʼihi Kraịst ka m na-anọgide nʼadịghị ike m niile, mkparị ndị mmadụ, ihe isi ike niile, mkpagbu niile na ihe ndakwasị dị iche iche. Nʼihi na mgbe m na-adịghị ike ka m na-enwe ike karịa.

2 Corinthians 12:10 in English

2 Corinthians 12:10 · Berean Standard Bible

That is why, for the sake of Christ, I delight in weaknesses, in insults, in hardships, in persecutions, in difficulties. For when I am weak, then I am strong.

Context

8Ekpeela m ekpere ugboro atọ rịọ Onyenwe anyị ka o wepụrụ m ahụ mgbu a. 9Ma ọ sịrị m, “Amara m ezuorola gị. Nʼihi na ike m na-ezu oke nʼime adịghị ike.” Ugbu a, obi dị m ụtọ ịnya isi banyere adịghị ike m. Nʼihi na ọ bụ site nʼọnọdụ adịghị ike m ka ike ebube Kraịst ga-esi nọgide nʼahụ m. 10Ọ bụ nʼihi Kraịst ka m na-anọgide nʼadịghị ike m niile, mkparị ndị mmadụ, ihe isi ike niile, mkpagbu niile na ihe ndakwasị dị iche iche. Nʼihi na mgbe m na-adịghị ike ka m na-enwe ike karịa. 11Emeela m onwe m onye nzuzu ma unu onwe unu rugidere m ime ya. O kwesiri ka unu bụrụ ndị mbụ ga-eto m. Ọ bụ ezie a na-abụghị m ihe ọbụla, ma o were m anya na ọ dịghị ụzọ ọbụla m si dị ala nʼebe ndị ahụ unu na-eche na ha kachasị elu nʼetiti ndị ozi. 12Ejiri m ndidi rụọ ọrụ nʼetiti unu, ihe iji gosi na abụ m nwaazụ* nʼeziokwu. Egosiri m unu ihe ịrịbama, ọrụ ebube dị iche iche, na ọtụtụ oke ọrụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.