2 Ndị Kọrint 11:8
2 Corinthians 11:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ nzukọ nọ nʼebe ọzọ nyeere m aka mgbe m na-arụ ọrụ nʼetiti unu. Ọ bụ site nʼaka ha ka m ji nata nkwado, dịka ụgwọ ọrụ m, ka m nwee ike inyere unu aka.
2 Corinthians 11:8 in English
2 Corinthians 11:8 · Berean Standard Bible
I robbed other churches by accepting their support in order to serve you.
Context
6Ọ bụrụ na m abụghị onye ọka okwu, abụ m onye ọka mmụta. Anyị akọwarala unu nke a ọtụtụ mgbe nʼụzọ dị iche iche nʼihe niile. 7Ọ ga-abụ na-emere m ihe ọjọọ mgbe m wedara onwe m ala ka e welie unu elu, nʼihi nʼanaghị m unu ihe ọbụla mgbe m na-ekwusara unu oziọma Chineke? 8Ọ bụ nzukọ nọ nʼebe ọzọ nyeere m aka mgbe m na-arụ ọrụ nʼetiti unu. Ọ bụ site nʼaka ha ka m ji nata nkwado, dịka ụgwọ ọrụ m, ka m nwee ike inyere unu aka. 9Ma mgbe m nọ nʼetiti unu abụghị m ibu arọ nye onye ọbụla nʼoge mkpa m. Nʼihi na ụmụnna si Masidonia wetaara m ihe niile na-akpa m mkpa. Ebe ọ bụ na m gbalịrị debe onwe m, ka m ghara ịbụ ibu arọ nye unu nʼụzọ ọbụla nʼoge gara aga, agaghị m abụkwa ibu arọ nye unu nʼoge dị nʼihu. 10Ebe eziokwu nke Kraịst dị nʼime m, ịnya isi m nke a agaghị akwụsị na mpaghara Akaịa* niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.