Native Bible

2 Corinthians 11:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, ọ bụghị ihe iju anya ma ọ bụrụ na ndị na-ejere ya ozi emee onwe ha dịka ndị na-eje ozi ụzọ ezi omume. Ma nʼọgwụgwụ oge, ha ga-anata ụgwọ dịka ọrụ ha si dị.

2 Corinthians 11:15 in English

2 Corinthians 11:15 · Berean Standard Bible

It is not surprising, then, if his servants masquerade as servants of righteousness. Their end will correspond to their actions.

Context

13Nʼihi na ndị dị otu a bụ ndị ozi ụgha, ndị ọrụ aghụghọ, ndị na-eme onwe ha ka ha bụ ndị ozi Kraịst. 14Ma omume ha adịghị eju m anya, nʼihi na ekwensu gbanwere onwe ya dịrị ka mmụọ ozi na-enye ìhè. 15Ya mere, ọ bụghị ihe iju anya ma ọ bụrụ na ndị na-ejere ya ozi emee onwe ha dịka ndị na-eje ozi ụzọ ezi omume. Ma nʼọgwụgwụ oge, ha ga-anata ụgwọ dịka ọrụ ha si dị. 16Dịka m kwuru na mbụ, ka onye ọbụla ghara iche na m bụ onye na-enweghị uche. Ọ bụrụkwarị na unu na-eche ụdị echiche a, biko naranụ m dịka onye na-enweghị uche, ka m nwee ike ịnya isi nke nta dịka ndị ọzọ si eme. 17Ma nʼihe m dabeere na-anya isi, adịghị m ekwu okwu dịka Onyenwe anyị ga-ekwu, maọbụ dịka onye na-enweghị uche.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.