2 Ndị Kọrint 1:17
2 Corinthians 1:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
E nwere m obi abụọ mgbe m chọrọ ime nke a? Ana m ezube nzube m dịka mmadụ nkịtị, onye dị nkwadobe ikwu “E,” na “E e,” nʼotu oge ahụ?
2 Corinthians 1:17 in English
2 Corinthians 1:17 · Berean Standard Bible
When I planned this, did I do it carelessly? Or do I make my plans by human standards, so as to say “Yes, yes” when I really mean “No, no”?
Context
15Ihe m na-ekwu were m anya, nke mere m ji chọọ ibu ụzọ bịa leta unu ka unu nwee uru abụọ. 16Ebu m ya nʼobi na m ga-akwụsị hụ unu mgbe m na-agafe ịga Masidonia. Ebukwa m ya nʼobi m na mgbe m si Masidonia na-alaghachi na m ga-akwụsịkwa ileta unu, ka unu nweekwa ike inyere anyị aka mgbe anyị bidoro ịlaghachi Judịa. 17E nwere m obi abụọ mgbe m chọrọ ime nke a? Ana m ezube nzube m dịka mmadụ nkịtị, onye dị nkwadobe ikwu “E,” na “E e,” nʼotu oge ahụ? 18Ma dịka Chineke si bụrụ onye kwesiri ntụkwasị obi, okwu anyị gwara unu abụghị “E,” na “E e.” 19Nʼihi na Ọkpara Chineke, Jisọs Kraịst, onye e sitere nʼọnụ Saịlas na Timoti na mụ onwe m kwusaa abụghị “E” na “E e,” kama nʼime ya ọ bụ naanị “E.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.