Native Bible

2 Corinthians 1:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ịnya isi anyị bụ nke a, na akọnuche anyị na-agbara anyị akaebe na anyị kpara agwa ọma nʼụwa, karịchasịa nʼebe unu nọ, nʼịdị nsọ na izi ezi nke si nʼaka Chineke. Nke a bụ site nʼamara o nyere anyị, ọ bụghị site nʼamamihe nke mmadụ.

2 Corinthians 1:12 in English

2 Corinthians 1:12 · Berean Standard Bible

And this is our boast: Our conscience testifies that we have conducted ourselves in the world, and especially in relation to you, in the holiness and sincerity that are from God—not in worldly * wisdom, but in the grace of God.

Context

10Ọ bụ Chineke bụ onye zọpụtara anyị site nʼime oke ọnwụ dị otu a. Anyị nwekwara ntụkwasị obi na ọ ga-aga nʼihu na-azọpụtakwa anyị, 11dịka unu ga-enyekwara anyị aka site nʼekpere unu, ka ọtụtụ nwere ike nye ekele nʼihi anyị maka onyinye amara anyị natara na nzaghachi ekpere ọtụtụ mmadụ ndị a na-ekpere anyị. 12Ịnya isi anyị bụ nke a, na akọnuche anyị na-agbara anyị akaebe na anyị kpara agwa ọma nʼụwa, karịchasịa nʼebe unu nọ, nʼịdị nsọ na izi ezi nke si nʼaka Chineke. Nke a bụ site nʼamara o nyere anyị, ọ bụghị site nʼamamihe nke mmadụ. 13Nʼihi na ihe anyị na-edere unu abụghị ihe unu na agaghị agụta maọbụ ghọta. Enwere m nchekwube na unu ga-aghọta ya nke ọma. 14Dịka unu ghọtarala anyị nwa nke nta ugbu a, unu ga-eji anyị anya isi nʼụbọchị nke Onyenwe anyị Jisọs.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.