2 Ihe E Mere 9:26
2 Chronicles 9:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ chịrị ndị eze niile site nʼosimiri Yufretis ruo nʼala ndị Filistia, rukwaa oke ala ndị Ijipt.
2 Chronicles 9:26 in English
2 Chronicles 9:26 · Berean Standard Bible
He reigned over all the kings from the Euphrates * to the land of the Philistines, as far as the border of Egypt.
Context
24Onye ọbụla bịakwutere ya na-ebutere ya onyinye ịnata ihuọma, ya bụ ngwa ọlaọcha na ọlaedo, na uwe dị iche iche, ngwa agha, ụda dị iche iche, ịnyịnya na ịnyịnya muul, nke a bụ kwa afọ, kwa afọ. 25Solomọn nwere ụlọ anụmanụ dị puku anọ maka ịnyịnya na ụgbọ agha, nwekwa puku ịnyịnya iri na abụọ ndị o dobere nʼobodo ụgbọ agha dị iche iche, na nʼebe eze nọ na Jerusalem. 26Ọ chịrị ndị eze niile site nʼosimiri Yufretis ruo nʼala ndị Filistia, rukwaa oke ala ndị Ijipt. 27Eze mere ka ọlaọcha baa ụba na Jerusalem, dịka nkume efu. O mekwara ka osisi sida dịka osisi sikamọ nke dị nʼala ala ugwu dị iche iche. 28A na-esite nʼIjipt na nʼala ndị ọzọ dị iche iche atụbatara Solomọn ịnyịnya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.