2 Ihe E Mere 9:22
2 Chronicles 9:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Eze Solomọn bara ụba nʼakụ, nweekwa amamihe karịa ndị eze niile dị nʼụwa.
2 Chronicles 9:22 in English
2 Chronicles 9:22 · Berean Standard Bible
So King Solomon surpassed all the kings of the earth in riches and wisdom.
Context
20Ihe niile Solomọn nwere nke e ji aṅụ ihe bụ ọlaedo ka e ji mee ha. Ngwongwo niile nke dị nʼime ụlọeze nʼOke Ọhịa Lebanọn bụkwa ọlaedo a nụchara anụcha ka e ji kpụọ ha. Ọ dịghị ihe e ji ọlaọcha kpụọ, nʼihi na-agụnyeghị ọlaọcha dịka ihe ọbụla nʼoge Solomọn. 21Eze nwere ọtụtụ ụgbọ mmiri e ji azụ ahịa nke ndị ohu Hiram na-elekọta. Otu ugbo nʼafọ atọ, ka ụgbọ ndị a na-alọta buru ọlaedo, ọlaọcha na ọdụ enyi, enwe na adaka dị iche iche bata. 22Eze Solomọn bara ụba nʼakụ, nweekwa amamihe karịa ndị eze niile dị nʼụwa. 23Ndị eze niile nke ụwa na-achọ ihu Solomọn, ka ha nụta okwu amamihe nke Chineke tinyere nʼobi ya. 24Onye ọbụla bịakwutere ya na-ebutere ya onyinye ịnata ihuọma, ya bụ ngwa ọlaọcha na ọlaedo, na uwe dị iche iche, ngwa agha, ụda dị iche iche, ịnyịnya na ịnyịnya muul, nke a bụ kwa afọ, kwa afọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.