2 Ihe E Mere 8:7
2 Chronicles 8:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị niile fọdụrụ ndụ nʼetiti ndị Het, ndị Amọrait, ndị Periz, ndị Hiv na Jebus (ndị a abụghị ndị Izrel),
2 Chronicles 8:7 in English
2 Chronicles 8:7 · Berean Standard Bible
As for all the people who remained of the Hittites, Amorites, Perizzites, Hivites, and Jebusites (the people who were not Israelites)—
Context
5O wugharịkwara obodo Bet-Horon nke dị nʼelu elu, wuokwa Ndịda Bet-Horon ka ọ ghọọ obodo e wusiri ike nke nwere mgbidi, ibo ọnụ ụzọ ama na mkpọrọ e ji kpọchie ha. 6O wukwara obodo Baalat na obodo niile nke ebe ịchịkọba ihe, na obodo niile ebe idebe ụgbọ agha na ịnyịnya ya niile. O wuru ihe ọbụla gụrụ obi ya agụụ iwu na Jerusalem, Lebanọn na nʼoke ala ahụ niile ọ na-achị. 7Ndị niile fọdụrụ ndụ nʼetiti ndị Het, ndị Amọrait, ndị Periz, ndị Hiv na Jebus (ndị a abụghị ndị Izrel), 8ndị ụmụ ụmụ ha fọdụrụ nʼala ahụ, ndị ahụ ndị Izrel na-ebibighị, ndị a ka Solomọn mere ndị ọrụ mmanye na ndị ohu, nke a bụkwa ọnọdụ ha ruo taa. 9Ma Solomọn emeghị ka onye Izrel ọbụla bụrụ ohu, maka ọrụ ya, kama ha bụ ndị ikom agha, ndịisi ndị ọchịagha ya, ndịisi ụgbọ agha na ndị na-agba ịnyịnya agha ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.