2 Ihe E Mere 7:8
2 Chronicles 7:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, Solomọn mere mmemme a nʼoge ahụ, ụbọchị asaa, ya na ndị Izrel niile. Ọ bụ nzukọ dị ukwuu. Ndị mmadụ bịara sitere na Lebo Hamat ruo na mmiri iyi Ijipt.
2 Chronicles 7:8 in English
2 Chronicles 7:8 · Berean Standard Bible
So at that time Solomon and all Israel with him—a very great assembly of people from Lebo-hamath to the Brook of Egypt—kept the feast * for seven days.
Context
6Ndị nchụaja guzo nʼihu ọrụ ha, ha na ndị Livayị. Ha jiri ngwa egwu Onyenwe anyị nke eze Devid mere maka ị na-eto Onyenwe anyị, bụkwa nke o ji mgbe o nyere ekele, na-asị, “Ịhụnanya ya na-adị ruo ebighị ebi.” Na ncherita ihu ndị Livayị, ndị nchụaja fụrụ opi ike ha mgbe ndị Izrel guzooro ọtọ. 7Mgbe ahụ, Solomọn doro etiti ogige dị nʼihu ụlọnsọ Onyenwe anyị ahụ nsọ. Nʼebe ahụ ka ọ nọ chụọ aja nsure ọkụ, aja onyinye mkpụrụ ọka na aja abụba udo. O mere nke a nʼihi na ebe ịchụ aja bronz nke ọ rụrụ enweghị ike ịbata aja nsure ọkụ niile, aja mkpụrụ ọka niile nakwa aja abụba ndị ahụ. 8Ya mere, Solomọn mere mmemme a nʼoge ahụ, ụbọchị asaa, ya na ndị Izrel niile. Ọ bụ nzukọ dị ukwuu. Ndị mmadụ bịara sitere na Lebo Hamat ruo na mmiri iyi Ijipt. 9Nʼụbọchị nke asatọ, ha nwere ọgbakọ, nʼihi na ha mere mmemme nke ido ebe ịchụ aja nsọ nʼime ụbọchị asaa, meekwa mmemme* ahụ abalị asaa ọzọ. 10Ya mere, nʼụbọchị nke iri abụọ na atọ nʼọnwa nke asaa, o zilagara ndị ahụ niile nʼụlọ ha, nʼịṅụrị ọṅụ na obi ụtọ nʼihi ihe ọma niile nke Onyenwe anyị Devid na Solomọn na ndị ya Izrel.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.