2 Ihe E Mere 7:20
2 Chronicles 7:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
mgbe ahụ, aga m esite nʼala m, bụ nke m nyere ha, hopu Izrel. Aga m ajụkwa ụlọnsọ a m doro nsọ nye Aha m, meekwa ka ọ ghọọ ihe e ji atụ ilu na ihe ịkpa ọchị nʼetiti ndị niile.
2 Chronicles 7:20 in English
2 Chronicles 7:20 · Berean Standard Bible
then I will uproot Israel from the soil I have given them, and I will banish from My presence this temple I have sanctified for My Name. I will make it an object of scorn and ridicule among all the peoples.
Context
18Aga m eme ka ocheeze ọchịchị gị guzosie ike, dịka mụ na nna gị Devid gbara na ndụ, mgbe m sịrị, ‘Ị ghaghị inwe onye nnọchite anya nʼocheeze nke ga-achị Izrel.’ 19“Ma ọ bụrụ unu alaghachi azụ, gbakụta ụkpụrụ na iwu niile, bụ nke m nyere unu azụ, pụọ gbasoro chi ndị ọzọ ife ha ofufe, na ịkpọ isiala nye ha, 20mgbe ahụ, aga m esite nʼala m, bụ nke m nyere ha, hopu Izrel. Aga m ajụkwa ụlọnsọ a m doro nsọ nye Aha m, meekwa ka ọ ghọọ ihe e ji atụ ilu na ihe ịkpa ọchị nʼetiti ndị niile. 21Ọ bụ ezie na ụlọnsọ ukwu a kachasị elu ugbu a, ma ọnọdụ ya ga-eju ndị niile ga-esi nʼakụkụ ya gafee anya, ha ga-asị, ‘Gịnị mere Onyenwe anyị ji mee ala a na ụlọnsọ a, ihe dị otu a?’ 22Ndị mmadụ ga-aza, ‘Ọ bụ nʼihi na ha gbakụtara Onyenwe anyị, Chineke nna nna ha, onye kpọpụtara ha site nʼala Ijipt azụ, makụọ chi ndị ọzọ, na-akpọ isiala na-efekwa ha ofufe. Ọ bụ nʼihi nke a ka O ji mee ka ihe ọjọọ niile ndị a bịakwasị ha.’ ”
7:9 Ya bụ, mmemme Ụlọ ikwu
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.