2 Ihe E Mere 6:38
2 Chronicles 6:38 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụrụ na ha ejiri obi ha na mmụọ ha niile chegharịa, nʼala ebe ndọta nʼagha ha, bụ ebe a kpọrọ ha gaa, ma kpee ekpere nye gị chee ihu ha nʼụzọ ala a nke i nyere nna nna ha, nʼobodo a nke ị họpụtara, ya na nʼụlọnsọ ukwu a m wuru nye Aha gị
2 Chronicles 6:38 in English
2 Chronicles 6:38 · Berean Standard Bible
and when they return to You with all their heart and soul in the land of the enemies who took them captive, and when they pray in the direction of the land that You gave to their fathers, the city You have chosen, and the house I have built for Your Name,
Context
36“Mgbe ha mehiere megide gị, nʼihi na ọ dịghị mmadụ ọbụla na-adịghị emehie, ị wee iwe megide ha, rara ha nyefee nʼaka ndị iro, ndị ga-adọkpụrụ ha nʼagha gaa nʼobodo ọzọ, maọbụ obodo dị anya maọbụ nke dị nso; 37ọ bụrụ na ha anọrọ nʼala ahụ a dọkpụrụ ha gaa, chegharịa nʼobi ha, nọrọ nʼala ebe a dọtara ha nʼagha, rịọọ gị, sị, ‘Anyị emehiela, anyị emeela ihe nʼadịghị mma, meekwa ajọ omume.’ 38Ọ bụrụ na ha ejiri obi ha na mmụọ ha niile chegharịa, nʼala ebe ndọta nʼagha ha, bụ ebe a kpọrọ ha gaa, ma kpee ekpere nye gị chee ihu ha nʼụzọ ala a nke i nyere nna nna ha, nʼobodo a nke ị họpụtara, ya na nʼụlọnsọ ukwu a m wuru nye Aha gị 39mgbe ahụ, site nʼeluigwe, ebe obibi gị, nụrụ ekpere ha na arịrịọ ha niile, nyekwara ha aka. Gbaghara ndị gị, bụ ndị mehiere megide gị. 40“Ugbu a, Chineke m, biko ka anya gị na ntị gị ghere oghe nʼekpere niile a na-ekpe nʼebe a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.