2 Ihe E Mere 6:18
2 Chronicles 6:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ma ọ bụ ezie na Chineke ga-ebinyere ụmụ mmadụ nʼelu ụwa? Lee, eluigwe, ọbụladị ebe kachasị elu nke eluigwe ezughị ịba gị. Olee otu ụlọ a nke m wuru ga-esi bata gị!
2 Chronicles 6:18 in English
2 Chronicles 6:18 · Berean Standard Bible
But will God indeed dwell with man upon the earth? Even heaven, the highest heaven, cannot contain You, much less this temple I have built.
Context
16“Ugbu a, O! Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel, mezukwaa nkwa niile i kwere Devid nna m, mgbe ị sịrị, ‘Ọ bụrụ na ụmụ ụmụ gị elezie anya bie ndụ dịka iwu m si dị nʼihu m, nʼihe niile ha na-eme, dịka gị onwe gị mere, agaghị achọ onye ga-anọ nʼihu nʼocheeze Izrel nʼime ha.’ 17Ma ugbu a, Onyenwe anyị bụ Chineke nke Izrel, ka okwu gị, bụ nkwa nke i kwere ohu gị Devid bịa na mmezu. 18“Ma ọ bụ ezie na Chineke ga-ebinyere ụmụ mmadụ nʼelu ụwa? Lee, eluigwe, ọbụladị ebe kachasị elu nke eluigwe ezughị ịba gị. Olee otu ụlọ a nke m wuru ga-esi bata gị! 19Ma Onyenwe anyị Chineke m, ṅaa ntị nʼekpere ohu gị, na arịrịọ ọ na-arịọ maka ebere. Nụrụ akwa na ekpere nke ohu gị na-ekpe nʼihu gị. 20Biko, mee ka anya gị abụọ ghere oghe nʼebe ụlọnsọ ukwu a dị, ehihie na nʼabalị, bụ ebe a i kwuru sị, na i ga-akpọkwasị Aha gị nʼebe ahụ. Biko, ka ị nụrụ ekpere ohu gị ga-ekpe banyere ebe a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.