2 Ihe E Mere 6:14
2 Chronicles 6:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ sịrị, “Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel, ọ dịghị Chineke dịka gị nʼeluigwe maọbụ nʼụwa. Gị onye na-edebe ọgbụgba ndụ ịhụnanya gị na ndị ohu gị, bụ ndị ji obi ha niile na-eso ụzọ gị.
2 Chronicles 6:14 in English
2 Chronicles 6:14 · Berean Standard Bible
and said: “O LORD, God of Israel, there is no God like You in heaven or on earth, keeping Your covenant of loving devotion with Your servants who walk before You with all their hearts.
Context
12Mgbe ahụ, Solomọn guzoro nʼihu ebe ịchụ aja Onyenwe anyị, na nʼihu ọgbakọ ụmụ Izrel niile, gbasapụ aka ya abụọ. 13Solomọn ji bronz kpụọ ihe nrigoro ịnọ gwa ọha mmadụ okwu. Ogologo ihe nrigoro ahụ, obosara ya ruru mita abụọ na ọkara mita abụọ na ọkara. Ịdị elu ya ruru otu mita na ọkara. O debere ya nʼetiti ebe mpụta nke ogige ụlọnsọ ukwu ahụ. O guzoro nʼelu ihe nrigo ahụ, nʼihu ọgbakọ Izrel niile, gbuo ikpere nʼala, gbasaa aka ya abụọ chilie ha elu. 14Ọ sịrị,
“Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel, ọ dịghị Chineke dịka gị nʼeluigwe maọbụ nʼụwa. Gị onye na-edebe ọgbụgba ndụ ịhụnanya gị na ndị ohu gị, bụ ndị ji obi ha niile na-eso ụzọ gị. 15I mezuokwala nkwa niile i kwere nna m Devid, bụ ohu gị. I ji ọnụ gị kwee nkwa a, ma taa, i jirila aka gị mezuo ya. 16“Ugbu a, O! Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel, mezukwaa nkwa niile i kwere Devid nna m, mgbe ị sịrị, ‘Ọ bụrụ na ụmụ ụmụ gị elezie anya bie ndụ dịka iwu m si dị nʼihu m, nʼihe niile ha na-eme, dịka gị onwe gị mere, agaghị achọ onye ga-anọ nʼihu nʼocheeze Izrel nʼime ha.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.