Native Bible

2 Chronicles 5:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O nweghị ihe dị nʼime igbe ọgbụgba ndụ ahụ, karịakwa mbadamba nkume abụọ ahụ Mosis tinyere nʼime ya nʼugwu Horeb, nʼebe Onyenwe anyị na ụmụ Izrel gbara ndụ, mgbe ha si nʼala Ijipt pụta.

2 Chronicles 5:10 in English

2 Chronicles 5:10 · Berean Standard Bible

There was nothing in the ark except the two tablets that Moses had placed in it at Horeb,* where the LORD had made a covenant with the Israelites after they had come out of Egypt.

Context

8Cherubim ndị ahụ gbasara nku ha nʼelu igbe ọgbụgba ndụ ahụ, kpuchie ya na okporo osisi ndị ahụ e ji ebu ya. 9Okporo osisi ndị a dị oke ogologo, na isi ha sitere nʼigbe ọgbụgba ndụ ahụ na-apụta, na e nwere ike ị site nʼihu ime ime ebe nsọ ahụ hụ ha anya, ma onye na-anọghị nʼEbe Nsọ ahụ adịghị ahụ ha. Ha ka dịkwa nʼebe ahụ ruo taa 10O nweghị ihe dị nʼime igbe ọgbụgba ndụ ahụ, karịakwa mbadamba nkume abụọ ahụ Mosis tinyere nʼime ya nʼugwu Horeb, nʼebe Onyenwe anyị na ụmụ Izrel gbara ndụ, mgbe ha si nʼala Ijipt pụta. 11Mgbe ndị nchụaja sitere nʼEbe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ pụta, nʼihi na ndị nchụaja ahụ niile doro onwe ha nsọ nʼagbanyeghị usuu nke onye ọbụla nʼime ha si pụta. 12Ma ndị Livayị bụ ndị ọbụ abụ, ya bụ Asaf, Heman, Jedutun na ụmụ ha ndị ikom na ndị ikwu ha guzoro onwe ha nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke ebe ịchụ aja. Ha yi uwe ezi akwa ọcha ma na-akpọ ụbọ akwara, na-akụkwa ogene ọla. Ndị nchụaja dị otu narị na iri abụọ (120) nʼọnụọgụgụ. Ndị na-afụ opi sokwa ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.