2 Ihe E Mere 36:8
2 Chronicles 36:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Akụkọ ọzọ niile gbasara ọchịchị Jehoiakim, na banyere ihe arụ niile o mere, na ihe niile a chọpụtara megide ya, ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Izrel na Juda. Jehoiakin nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
2 Chronicles 36:8 in English
2 Chronicles 36:8 · Berean Standard Bible
As for the rest of the acts of Jehoiakim, the abominations he committed, and all that was found against him, they are indeed written in the Book of the Kings of Israel and Judah. And his son Jehoiachin reigned in his place.
Context
6Nebukadneza eze Babilọn busoro ya agha, jiri ụdọ bronz kee ya agbụ, nʼihi i duru ya gaa Babilọn. 7Nebukadneza bukọkwaara efere na iko ọlaedo dị nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, buru ha gaa buba ha nʼụlọeze ya dị na Babilọn. 8Akụkọ ọzọ niile gbasara ọchịchị Jehoiakim, na banyere ihe arụ niile o mere, na ihe niile a chọpụtara megide ya, ka e dere nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Izrel na Juda. Jehoiakin nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya. 9Jehoiakin gbara afọ iri na asatọ* mgbe ọ malitere ịbụ eze, ọ chịrị naanị ọnwa atọ na abalị iri na Jerusalem. O mere ihe jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị. 10Emesịa, nʼafọ nke ọzọ ya, Nebukadneza ziri ozi mee ka akpọrọ ya, na ọtụtụ ihe ndị dị oke ọnụahịa sitere nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, bulaa ha Babilọn nʼoge a. O mere nwanne nna Jehoiakin bụ Zedekaya, eze Juda na Jerusalem.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.