2 Ihe E Mere 35:9
2 Chronicles 35:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị bụ ndị ndu nʼebo Livayị aha ha bụ Konanaya, na Shemaya, na Netanel, na nwanne ya Hashabaya, na Jeiel, na Jozabad, nyere ndị Livayị puku ewu na atụrụ ise, na narị oke ehi ise maka iji ha chụọ aja Ngabiga.
2 Chronicles 35:9 in English
2 Chronicles 35:9 · Berean Standard Bible
Additionally, Conaniah and his brothers Shemaiah and Nethanel, as well as Hashabiah, Jeiel, and Jozabad, officers of the Levites, donated to the Levites 5,000 Passover offerings and 500 bulls.
Context
7Josaya nyere ndị niile nọ nʼebe ahụ onyinye igwe ewu na atụrụ ọnụọgụgụ ya dị iri puku atọ, nke ha ga-eji chụọ aja Mmemme Ngabiga. O nyekwara ha puku oke ehi atọ site nʼakụ eze. 8Ndịisi ya nyekwara ndị nchụaja na ndị Livayị onyinye afọ ofufu. Otu a kwa, Hilkaya na Zekaraya, na Jehiel, ndị na-elekọta ụlọnsọ Chineke nyere ndị nchụaja puku ewu na atụrụ abụọ na narị isii, nyekwa ha narị oke ehi atọ, maka iji chụọ aja Ngabiga. 9Ndị bụ ndị ndu nʼebo Livayị aha ha bụ Konanaya, na Shemaya, na Netanel, na nwanne ya Hashabaya, na Jeiel, na Jozabad, nyere ndị Livayị puku ewu na atụrụ ise, na narị oke ehi ise maka iji ha chụọ aja Ngabiga. 10Mgbe e dozichara usoro ije ozi ahụ niile, ndị nchụaja weere ọnọdụ ha, ha na ndị Livayị nʼoke ọrụ ha nʼusoro dịka eze nyere nʼiwu. 11Mgbe ahụ ndị Livayị gburu atụrụ ngabiga ahụ niile, were ọbara ha nye ndị nchụaja. Ha fesara ya nʼebe ịchụ aja mgbe ndị Livayị nọ na-agba anụ ndị ahụ akpụkpọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.