2 Ihe E Mere 35:3
2 Chronicles 35:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ sịrị ndị Livayị, bụ ndị e doro nsọ nye Onyenwe anyị, ndị na-emekwa ka ndị Izrel ghọta ihe, “Dọnyenụ igbe nsọ ahụ nʼụlọnsọ ukwu ahụ Solomọn, nwa Devid, bụ eze Izrel wuru. Unu ekwesịkwaghị ị na-ebugharị ya nʼubu unu ọzọ. Ugbu a jeerenụ Onyenwe anyị Chineke unu, na ndị ya Izrel ozi.
2 Chronicles 35:3 in English
2 Chronicles 35:3 · Berean Standard Bible
To the Levites who taught all Israel and were holy to the LORD, Josiah said: “Put the holy ark in the temple built by Solomon son of David king of Israel. It is not to be carried around on your shoulders. Now serve the LORD your God and His people Israel.
Context
1Josaya mere Mmemme Ngabiga Onyenwe anyị na Jerusalem nʼụbọchị iri na anọ nke ọnwa mbụ nʼafọ. Ha gburu atụrụ Mmemme Ngabiga nʼụbọchị ahụ 2O debekwara ndị nchụaja nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, gbaa ha ume ka ha bidokwa ịrụ ọrụ ha. 3Ọ sịrị ndị Livayị, bụ ndị e doro nsọ nye Onyenwe anyị, ndị na-emekwa ka ndị Izrel ghọta ihe, “Dọnyenụ igbe nsọ ahụ nʼụlọnsọ ukwu ahụ Solomọn, nwa Devid, bụ eze Izrel wuru. Unu ekwesịkwaghị ị na-ebugharị ya nʼubu unu ọzọ. Ugbu a jeerenụ Onyenwe anyị Chineke unu, na ndị ya Izrel ozi. 4Kwadoonụ onwe unu nʼusoro ezinaụlọ unu nʼotu nʼotu, dịka ntụziaka ihe Devid, eze Izrel dere nʼakwụkwọ si dị, ya na nke Solomọn nwa ya si dịkwa. 5“Werenụ ọnọdụ nʼebe nsọ unu na otu ndị Livayị, maka nkewa nke ezinaụlọ nna nna unu ha si dị, bụ ikwu ndị Izrel, ndị na-abụghị ndị nchụaja.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.