2 Ihe E Mere 34:7
2 Chronicles 34:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O titụrụ ebe ịchụ aja nke arụsị niile na ogidi arụsị Ashera, gwepịa arụsị ndị a niile dịka ntụ. Otu a ka o mere nʼala Izrel niile tupu ọ laghachi Jerusalem.
2 Chronicles 34:7 in English
2 Chronicles 34:7 · Berean Standard Bible
He tore down the altars and Asherah poles, crushed the idols to powder, and cut to pieces all the incense altars throughout the land of Israel. Then he returned to Jerusalem.
Context
5Ọ kpọrọ ọkpụkpụ ndị nchụaja ahụ ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja arụsị ha, si otu a mee ka Juda na Jerusalem dị ọcha. 6Nʼobodo ndị Manase, na Ifrem na Simiọn, ruo na Naftalị, na mkpọmkpọ ebe ha niile gburugburu. 7O titụrụ ebe ịchụ aja nke arụsị niile na ogidi arụsị Ashera, gwepịa arụsị ndị a niile dịka ntụ. Otu a ka o mere nʼala Izrel niile tupu ọ laghachi Jerusalem. 8Nʼafọ nke iri na asatọ nke ọchịchị Josaya, mgbe o mere ka ala ahụ na ụlọnsọ dị ọcha, o zigara Shefan nwa Azalaya, Maaseia onye na-achị obodo, na Joa nwa Joahaz, onye na-edekọ akụkọ, ka ha wuzie ụlọnsọ Onyenwe anyị, bụ Chineke ya. 9Ha jekwuru Hilkaya onyeisi nchụaja nye ya ego nke e webatara nʼụlọnsọ Chineke, nke ndị Livayị bụ ndị na-eche ọnụ ụzọ nakọtara site nʼaka ndị Manase na Ifrem, na ndị niile fọdụrụ nʼIzrel, na sitekwa nʼaka ndị Juda na Benjamin, na ndị niile bi na Jerusalem.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.