Native Bible

2 Chronicles 34:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ sịrị ha, “Otu a ka Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel, kwuru: Gwanụ nwoke ahụ ziri unu ka unu bịakwutem, sị

2 Chronicles 34:23 in English

2 Chronicles 34:23 · Berean Standard Bible

And Huldah said to them, “This is what the LORD, the God of Israel, says: ‘Tell the man who sent you

Context

21“Gaanụ jụta Onyenwe anyị ase, nʼisi m na nʼisi ndị fọdụrụ nʼIzrel na Juda, banyere ihe niile e dere nʼakwụkwọ a bụ nke achọtara. Nʼihi na ọnụma Onyenwe anyị dị ukwuu bụ nke a wụkwasịrị anyị, nʼihi na ndị bu anyị ụzọ edebeghị okwu nke Onyenwe anyị, ha agbasoghị ihe niile e dere nʼime akwụkwọ a banyere anyị.” 22Ya mere, Hilkaya na ndị ahụ eze zipụrụ ya na ha, jekwuuru Hulda, onye amụma nwanyị, onye bụ nwunye Shalum, nwa Tokhat, nwa Hasra. Onye nlekọta ebe a na-edebe uwe. Hulda na-ebi na mpaghara Jerusalem e wuru ọhụrụ. 23Ọ sịrị ha, “Otu a ka Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel, kwuru: Gwanụ nwoke ahụ ziri unu ka unu bịakwutem, sị 24‘Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu: Ana m aga iweta mbibi ga-adakwasị ebe a na ndị niile bi nʼime ya, ọbụbụ ọnụ niile e dere nʼime akwụkwọ a, bụ nke a gụpụtara nʼihu eze Juda. 25Nʼihi na ha ajụla m, gbakụta m azụ, chụọ aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye chi ndị ọzọ, kpasuo m iwe site na ihe niile nke aka ha mepụtara, a ga-awụkwasị iwe m nʼebe a, ọ gaghị akwụsịkwa.’

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.