2 Ihe E Mere 34:1
2 Chronicles 34:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Josaya gbara afọ asatọ mgbe e mere ya eze. Ọ chịrị iri afọ atọ na otu na Jerusalem.
2 Chronicles 34:1 in English
2 Chronicles 34:1 · Berean Standard Bible
Josiah was eight years old when he became king, and he reigned in Jerusalem thirty-one years.
Context
1Josaya gbara afọ asatọ mgbe e mere ya eze. Ọ chịrị iri afọ atọ na otu na Jerusalem. 2O mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị, gbasookwa ụzọ niile nke nna nna ya Devid, o sighị nʼụzọ a wezuga onwe ya gaa nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe. 3Nʼafọ nke asatọ nke ọchịchị ya, mgbe ọ ka bụ okorobịa, o bidoro iji obi ya niile na-achọ Chineke nke nna ya Devid. Nʼafọ iri na abụọ nke ọchịchị ya, ọ malitere ime ka Juda na Jerusalem dị ọcha site nʼiwezuga ebe ịchụ aja niile dị elu, na ogidi Ashera niile, na arụsị a pịrị apị na nke a kpụrụ akpụ niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.